banner image
banner image

akuko ihe mere:Ọbà Akwụkwọ Kenneth Dike Emee Ncheta Ụbọchị Akwụkwọ Na Mba Ụwa

akuko ihe mere:Ọbà Akwụkwọ Kenneth Dike Emee Ncheta Ụbọchị Akwụkwọ Na Mba Ụwa

igbo radio news
Ụlọ ezumezu nke ọbá akwụkwọ Ọkammụta Kenneth Dike dị n'Awka juputara nnọọ gbịm gbịm n'ọnụ dịka igwe mmadụ sitere n'ebe dị iche iche bịara isonye na mmemme ncheta ụbọchị akwụkwọ na mba ụwa, nke ahọ 2018.
Oke mmemme ahụ bụ nke a chịkọbara site n'aka ọba akwụkwọ steeti ahụ, ma bụrụkwa nke dọtara ihe karịrị ìgwè mmadụ karịrị narị ise n'ọnụ ọgụgụ, ndị gụnyere ndị nkụzi, ụmụ akwụkwụ, ndị ntorobịa, ndị nne na nna, ndị ọrụ gọọmenti, ndị selitere isi na ngalaba mmụta, ndị ode akwụkwọ, ndị ọrụ mgbasa ozi, tinyere ndị ọzọ dị iche iche hụrụ odide na ọgụgụ n'anya.
N'ozi nnọọ ya, onye jigodi ọkwa dịka onyeisi ọba akwụkwọ ahụ, bụ nwaada Nkechi Udenze kọwara ụbọchị ahụ, bụ abalị iri abụọ na atọ nke ọnwa Epure ahọ ọbụla dịka ụbọchị ndị otu UNESCO weputara maka iji merube ma gosipụta ịma mma nke akwụkwọ na oke uru dị iche iche akwụkwọ bara na ndụ mmadụ. Ọ kọwara akwụkwọ dịka ihe onwunwe dị oke ọnụ ahịa nakwa ihe ụtọ nke na-adịgide, ma kpọkuzie ụmụ akwụkwọ na ndị ọzọ ndị bịara ya bụ mmemme ka ha makụọ ịgụsi akwụkwọ ike n'ihi na ngwere ghara ukwu osisi, aka akpara ya, tinyekwuoro na ịgụsi akwụkwọ ike ga-eme ka mmadụ mee nke ọma na agụmakwụkwọ ya, nwetawanye ọgụgụ isi pụrụ iche, ma mekwa nke ọma n'ihe ọbụla o tinyere aka na ndụ a.
N'okwu nke ya, ode akwụkwọ ọkpụtọrọkpụ na ministịrị na-ahụ maka agụmakwụkwọ na steeti ahụ, nke onye nọchitere anya ya bụ maazị Samuel Obi mere ka a mara na ọchịchị steeti ahụ emeela ntụnye dị ukwuu iji kwalite ọnọdụ mmụta na agụmakwụkwọ na steeti ahụ, ebe aka na-achị steeti ahụ bụ gọvanọ Willie Obianọ gosipụtagoro ụdị mmasị pụrụ iche o nwere banyere ịkwalite ọnọdụ mmụta, site n'ikewapụta ministịrị abụọ maka agụmakwụkwọ na steetu ahụ.
Na mbụ n'okwu mmalite ya, onyeisi oche na mmemme ahụ, bụ maazị Azụbike Okoro kwuru na ebumnobi mmemme ahụ gụnyere iwulite mmụọ ụmụakwụkwọ ka ha mara mkpa ọ dị ịgụsi akwụkwọ ike, nakwa ịgụ ya kwa ụbọchị. O kwuputekwara mkpa ọ dị ka ụmụakwụkwọ na-agụ akwụkwọ e dere n'asụsụ Igbo, ma na-elegakwara ọmụmụ asụsụ Igbo anya dịka ihe mmadụ nwere ike ịgụ na mahadum, dịka ọ kọwara na ndị gụrụ ọmụmụ asụsụ Igbo bụzịkwa ndị a na-achọsi ike ugbu a maka iwe ha n'ọrụ, ma n'ala Naịjiria ma na mpụga ya.
Ndị ọzọ kwuru okwu na mmemme ahụ, nke gụnyere oriakụ Ijeọma Anyadike (bụ onye e ji okwu ya agba izu na nglaba mmụta); oriakụ Amaka Okafor (bụ Onyeisi oche otu Reading Association of Nigeria); oriakụ Ọbalụm (bụ onyeisi ngalaba na-ebìnye akwụkwụ n'ọba akwụkwọ Kenneth Dike); oriakụ Hope Nwakwesiri (Onye na-ede akwụkwọ); maazị Eze Ọnwụji (onye mgbasa ozi), na ọtụtụ ndị ọzọ, kelere ndị chịkọbara ọgbakọ ahụ, ma kpọkuziekwa ụmụakwụkwọ na ọhaneze ndị bịara mmemme ahụ ka ha gbaa mbọ site n'irite uru n'ihe niile ahụ dị iche iche ọchịchị steeti ahụ, ọba akwụkwọ na otu ndị ozọ na-achịkọba iji kwalite ezi mmụta na steeti ahụ.
Ihe pụtakarịchara ihè na mmemme ahụ gụnyere ịgụpụta akwụkwọ, ejije e mere, ịgụpụta abụ, inye nkụzi, nakwa inye ụlọ akwụkwọ dị iche iche bịara ọgbakọ ahụ onyinye akwụkwọ ọgụgụ dị iche iche maka ọba akwụkọ ha.
akuko ihe mere:Ọbà Akwụkwọ Kenneth Dike Emee Ncheta Ụbọchị Akwụkwọ Na Mba Ụwa akuko ihe mere:Ọbà Akwụkwọ Kenneth Dike Emee Ncheta Ụbọchị Akwụkwọ Na Mba Ụwa Reviewed by Listener on May 06, 2018 Rating: 5

No comments:

Powered by Blogger.